16Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.”
17Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.”
18Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya.
19Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ.
20Mgbe ahụ, Jekọb kwere nkwa sị, “Ọ bụrụ na Chineke ga-anọnyere m, chebe m nʼije m na-eje, ọ bụrụ na ọ ga-enye m ihe oriri m ga-eri na uwe m ga-eyi,