1Aịzik kpọrọ Jekọb gọzie ya, nye ya iwu sị ya, “Alụla nwunye site nʼala Kenan.
2Kama bilie gaa Padan Aram nʼụlọ nna nne gị, Betuel, lụrụ nwunye site nʼụmụ ndị inyom Leban.
3Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gọzie gị, mee ka ị mịa mkpụrụ, mụbaa, ghọọ ọtụtụ mba.
4Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.”
5Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ.