2Kama bilie gaa Padan Aram nʼụlọ nna nne gị, Betuel, lụrụ nwunye site nʼụmụ ndị inyom Leban.
3Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gọzie gị, mee ka ị mịa mkpụrụ, mụbaa, ghọọ ọtụtụ mba.
4Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.”
5Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ.
6Ịsọ hụrụ ka Aịzik siri gọzie Jekọb, ziga ya Padan Aram ka ọ gaa lụọ nwunye nʼebe ahụ, nyekwa ya iwu mgbe ọ na-agọzi ya sị, “Alụla nwanyị na Kenan,”