1Jekọb gara nʼihu nʼije ya rute nʼala dị nʼọwụwa anyanwụ.
2NʼEbe Nsọ a, ọ hụrụ otu olulu mmiri, hụkwa ụzọ igwe atụrụ atọ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri nʼihi na ndị na-elekọta ha na-enye ha mmiri site nʼolulu mmiri ahụ. Nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ buru ibu.
3Nʼihi na mgbe igwe atụrụ niile bịazukọtara nʼolulu mmiri ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-emeghepụ nkume ahụ nye ha mmiri. Emesịa, ha na-ejikwa nkume ahụ mechie ọnụ olulu mmiri ahụ.
4Jekọb jekwuru ndị na-elekọta atụrụ ahụ jụọ ha sị, “Ụmụnna m, ebee ka unu si?” Ha zara sị ya, “Anyị si Haran.”