9Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, “Ebee ka ị nọ?”
10Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.”
11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?”
12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”
13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.”