Jenesis 3

Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”

Genesis 3:12 (UKJV) And the man said, The woman whom you gave to be with me, she gave me of the tree, and I did eat.

10Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.”

11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?”

12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”

13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.”

14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.