8Rechel kwuru sị, “Mgba dị ukwuu ka mụ na nwanne m nwanyị gbara, m merie.” Ọ kpọọ ya Naftalị.
9Lịa hụrụ na ya akwụsịla ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa, odibo ya nwanyị kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya.
10Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke.
11Mgbe nke a mere, Lịa kwuru sị, “Nke a bụ ihuọma.” Ọ kpọrọ nwa ahụ Gad.
12Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.