10Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke.
11Mgbe nke a mere, Lịa kwuru sị, “Nke a bụ ihuọma.” Ọ kpọrọ nwa ahụ Gad.
12Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
13Mgbe ahụ Lịa kwuru sị, “Ọṅụ ejula m obi, nʼihi na ụmụ nwanyị ibe m ga-akpọ m onye ihe na-agara nke ọma.” Lịa kpọrọ nwantakịrị nwoke ahụ Asha.
14Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki. Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.”