41Mgbe ọbụla nne anụ ụlọ ndị ahụ siri ike nọ nʼọnọdụ ịtụrụ ime, Jekọb na-edobe ngalaba osisi ndị ahụ nʼakụkụ ebe ha na-aṅụ mmiri nʼihu ha, ka ha nọrọ nʼebe ahụ gbaa onwe ha.
42Ma ọ bụrụ na anụ ụlọ ndị ahụ adịghị ike, Jekọb anaghị edebe osisi ndị a nʼihu ha. Ya mere, igwe ewu na atụrụ ndị na-esighị ike gaara Leban. Ma ndị siri ike gaara Jekọb.
43Site nʼụzọ dị otu a, Jekọb ghọrọ onye nwere akụ hie nne. O nwekwara ọtụtụ igwe anụ ụlọ na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi nwoke na nwanyị, na ọtụtụ ịnyịnya kamel, na ọtụtụ ịnyịnya ibu ndị ọzọ.