1Jekọb nụrụ na ụmụ ndị ikom Leban na-asị, “Jekọb ewerechaala ihe niile nna anyị nwere. O sitere nʼihe nna anyị nwere kpata akụnụba ya niile.”
2Jekọb hụkwara na omume Leban nʼebe ọ nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ.
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.”