4Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya.
5Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke.
6Nke a mere ka Rechel kwuo sị, “Chineke ekpepụtala m. Ọ nụla arịrịọ m nye m nwa nwoke.” Nʼihi nke a, Rechel gụrụ nwa ahụ Dan.
7Bilha, odibo nwanyị Rechel, tụụrụ ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke abụọ.
8Rechel kwuru sị, “Mgba dị ukwuu ka mụ na nwanne m nwanyị gbara, m merie.” Ọ kpọọ ya Naftalị.