11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’
12Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị.
13Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ”
14Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị?
15Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị.