14Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị?
15Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị.
16Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.”
17Jekọb biliri, kukwasị ụmụ ya na ndị nwunye ya nʼelu ịnyịnya kamel,
18duru igwe anụ ụlọ ya niile, na ihe ọ kpatara na Padan Aram, lakwuru nna ya Aịzik nʼala Kenan.