19Ka Leban gara ịkpachapụ ajị ụmụ atụrụ ya, Rechel zuuru arụsị ezinaụlọ nna ya.
20Jekọb ghọkwara Leban onye Aram aghụghọ nʼihi na ọ gwaghị ya na ọ na-agbapụ ọsọ.
21Ya mere, o buru ihe niile o nwere gbapụ ọsọ, gbafee iyi ukwu Yufretis, chee ihu nʼala ugwu ugwu Gilead.
22Abalị atọ agafeelarị tupu a gwa Leban na Jekọb agbalaala.
23O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead.