23O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead.
24Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.”
25Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ.
26Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha?
27Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị?