37Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe.
38“Iri afọ abụọ ka mụ na gị nọrọ. O nweghị mgbe ime pụrụ ụmụ ewu na atụrụ gị; o nwekwaghị mgbe m riri ebule si nʼigwe anụ ụlọ gị.
39O nweghị mgbe m welataara gị anụ ụlọ nke anụ ọhịa dọgburu, kama akwụrụ m ụgwọ ha. I mekwara ka m kwụghachi gị anụ ụlọ ọbụla e zuru nʼohi, maọbụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị.
40Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ.
41Otu a ka ọ dịrị m iri afọ abụọ m jeere gị ozi. Arụrụ m gị ọrụ afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a, afọ isii ka m lekọtara igwe ewu na atụrụ gị. Ị nọkwa nʼime ihe ndị a gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri.