47Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya.
48Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed.
49A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso.
50Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.”
51Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị.