50Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.”
51Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị.
52Nkume ndị a a wụsara bụ akaebe, ogidi a bụkwa ihe ama. Agaghị m agabiga nkume ndị a a wụsara gafeeta nʼakụkụ nke gị ime gị ihe ọjọọ. Gị onwe gị agaghị agabiga nkume ndị a a wụsara na ogidi a gafeeta nʼakụkụ nke m ime m ihe ọjọọ.
53Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ, Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.” Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi.
54Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ.