Jenesis 34

Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru.

Genesis 34:18 (UKJV) And their words pleased Hamor, and Shechem Hamor's son.

16Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị.

17Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.”

18Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru.

19Nwokorobịa ahụ bụ onye a na-asọpụrụ karịa onye ọbụla nʼụlọ nna ya egbughị oge ime ihe ha kwuru, nʼihi na ihe banyere nwa nwanyị Jekọb dị ya mma nke ukwuu.

20Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.