14Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere.
15Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.
16Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị.
17Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.”
18Obi tọrọ Hamọ na Shekem nwa ya nwoke ụtọ nʼihi ihe ụmụ ndị ikom Jekọb kwuru.