20Emesịa, Hamọ na Shekem nwa ya nwoke gara nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha gwa ndị ikom obodo ha okwu, sị.
21“Ndị ikom ndị a nwere mmasị nʼebe anyị nọ. Kwerenụ ka ha biri nʼala anyị, ka ha na-agagharị kwa nʼime ya. Anyị nwere ala buru ibu nke ga-ezuru anyị na ha. Ha ga-alụ ụmụ nwanyị anyị, anyị ga-alụkwa ndị nke ha.
22Ma ọ dị otu ihe ha chọrọ ka anyị mee tupu ha ekwere ibi nʼetiti anyị ka anyị na ha bụrụ otu ndị. Ọ bụ ibi ndị ikom anyị niile ugwu dịka e si bie ha ugwu.
23Ọ bụrụ na unu chọrọ ka anụ ụlọ ha niile na akụ ha niile bụrụ nke anyị, ọ dị mma ka anyị kwenyere ha, ka ha binyere anyị.”
24Ndị ikom niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ kwenyere nʼokwu Hamọ na nwa ya nwoke Shekem. E bikwara nwoke ọbụla nọ nʼobodo ahụ ugwu.