7Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme.
8Ma Hamọ sịrị ha, “Nwa m nwoke Shekem hụrụ nwa unu nwanyị nʼanya. Biko, kwerenụ ka ọ lụọ ya.
9Kwerenụ ka anyị na unu na-alụrịta. Ka anyị na-alụ ụmụ ndị inyom unu, ka unu na-alụkwa ụmụ ndị inyom anyị.
10Unu nwere ike biri nʼetiti anyị. Ala a ghere oghe nye unu. Birinụ nʼime ya, na-azụkwanụ ahịa nʼime ya, nwekwanụ akụ nʼime ya nye onwe unu.”
11Shekem gwara nna na ụmụnne Daịna ndị ikom sị, “Kwerenụ ka m chọta ihuọma nʼebe unu nọ, aga m enyekwa unu ihe ọbụla unu chọrọ ka m nye unu.