1Chineke sịrị Jekọb, “Bilie, gaa Betel, birikwa nʼebe ahụ. Wuo ebe ịchụ aja nye Chineke, onye mere ka ị hụ ya mgbe ị na-agbanarị Ịsọ nwanne gị nwoke.”
2Ya mere, Jekọb gwara ndị ezinaụlọ ya na ndị niile so ya sị, “Wezuganụ chi ndị ala ọzọ dị nʼetiti unu. Doonụ onwe unu ọcha, gbanweekwanụ uwe unu.
3Bilienụ, ka anyị gaa Betel, ebe m ga-ewu ebe ịchụ aja nye Chineke, onye zara m oku nʼụbọchị nsogbu m, ma nọnyekwara m na njem nke m gara.”