29Akụ ha niile, na ndị inyom ha niile na ụmụntakịrị ha, na ihe niile dị nʼime ụlọ ha, ka ha weere dịka ihe a dọtara nʼagha.
30Mgbe Jekọb hụrụ ihe ụmụ ya mere, ọ kpọrọ Simiọn na Livayị sị ha, “Unu ebuterela m nsogbu mee ka m bụrụ ihe na-esi isi ọjọọ nʼetiti ndị Kenan na ndị Periz nwe ala a. Ebe anyị dị ole na ole, ọ bụrụ na ha ejikọta onwe ha ọnụ lụso m agha, ha ga-ekpochapụ mụ na ezinaụlọ m.”
31Ma ha zara sị ya, “O kwesiri ka o meso nwanne anyị nwanyị mmeso dịka ọ bụ akwụna?”