Jenesis 35

Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.

Genesis 35:13 (UKJV) And God went up from him in the place where he talked with him.

11Chineke sịrị ya, “Abụ m Chineke onye pụrụ ime ihe niile. Mụọ ọmụmụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Otu mba na igwe mba ga-esi na gị pụta. Ndị eze ga-esitekwa gị nʼahụ pụta.

12Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.”

13Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.

14Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ.

15Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.