Jenesis 35

Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ.

Genesis 35:14 (UKJV) And Jacob set up a pillar in the place where he talked with him, even a pillar of stone: and he poured a drink offering thereon, and he poured oil thereon.

12Ala ahụ m nyere Ebraham na Aịzik ka m na-enyekwa gị. Aga m enyekwa ya ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị.”

13Emesịa, Chineke si nʼebe ahụ ha nọ kparịtaa ụka pụọ.

14Jekọb wuru ogidi nkume nʼebe ahụ Chineke nọ gwa ya okwu. Ọ wụsara onyinye ihe ọṅụṅụ wụkwasịkwa mmanụ nʼelu ogidi nkume ahụ.

15Jekọb kpọrọ ebe ahụ ya na Chineke nọ kparịtaa ụka Betel.

16Ha biliri ije, site na Betel. Ma mgbe ha ka nọ ebe dị anya site nʼobodo Efrat, Rechel mụrụ nwa, ma o nwere ihe mgbu ka ọ na-amụ nwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.