Jenesis 35

Izrel malitere ije ya, tutu ruo ebe o wuru ebe izuike ya nʼala dị nʼofe ọzọ nke Migdal Eda.

Genesis 35:21 (UKJV) And Israel journeyed, and spread his tent beyond the tower of Edar.

19Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem.

20Jekọb wuru ogidi nʼelu ili ya, nke na-eguzokwa ruo taa, igosi ebe e liri Rechel.

21Izrel malitere ije ya, tutu ruo ebe o wuru ebe izuike ya nʼala dị nʼofe ọzọ nke Migdal Eda.

22Mgbe Izrel bi nʼala ahụ, Ruben gara dinakwuru Bilha, iko nwanyị nna ya. E mekwara ka Izrel nụ ihe a Ruben mere. Ụmụ ndị ikom Jekọb dị iri na abụọ.

23Ụmụ Lịa bụ, Ruben, ọkpara Jekọb. Simiọn, Livayị, Juda, Isaka na Zebụlọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.