Jenesis 35

Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem.

Genesis 35:19 (UKJV) And Rachel died, and was buried in the way to Ephrath, which is Bethlehem.

17Mgbe o sitere nʼoke ihe mgbu na-amụpụta nwa ahụ, nwanyị na-aghọ nwa gwara ya, “Atụla egwu, nʼihi na ọ bụ nwa nwoke ọzọ ka ị mụtara.”

18Ma tupu Rechel ekuo ume ikpeazụ, nʼihi na ọ na-anwụ, ọ kpọrọ aha nwa ọhụrụ ahụ Ben-Oni, ma nna ya kpọrọ ya Benjamin.

19Rechel nwụrụ, e lie ya nʼakụkụ ụzọ gara Efrat, nke a na-akpọkwa Betlehem.

20Jekọb wuru ogidi nʼelu ili ya, nke na-eguzokwa ruo taa, igosi ebe e liri Rechel.

21Izrel malitere ije ya, tutu ruo ebe o wuru ebe izuike ya nʼala dị nʼofe ọzọ nke Migdal Eda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.