27Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ.
28Nʼoge ahụ Aịzik gbara narị afọ na iri afọ asatọ.
29Ọ dịkwaghị anya site nʼoge a, Aịzik nwụrụ, mgbe o mere nnọọ agadi. Ụmụ ya ndị ikom abụọ, Ịsọ na Jekọb, liri ya.