Jenesis 35

Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ.

Genesis 35:27 (UKJV) And Jacob came unto Isaac his father unto Mamre, unto the city of Arbah, which is Hebron, where Abraham and Isaac sojourned.

25Ụmụ Bilha, odibo nwanyị Rechel bụ, Dan na Naftalị.

26Ụmụ Zilpa, odibo nwanyị Lịa bụ, Gad na Asha. Ụmụ ndị ikom ndị a ka a mụụrụ Jekọb na Padan Aram.

27Nʼikpeazụ, Jekọb bịakwutere nna ya Aịzik na Mamre nke dị nso na Kiriat Arba (ebe a na-akpọ Hebrọn). Ebe ahụ ka Ebraham na Aịzik biri na mbụ.

28Nʼoge ahụ Aịzik gbara narị afọ na iri afọ asatọ.

29Ọ dịkwaghị anya site nʼoge a, Aịzik nwụrụ, mgbe o mere nnọọ agadi. Ụmụ ya ndị ikom abụọ, Ịsọ na Jekọb, liri ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.