12Elifaz nwa Ịsọ nwere iko nwanyị aha ya bụ Timna, onye mụtaara ya Amalek. Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ada, nwunye Ịsọ.
13Ụmụ ndị ikom Reuel bụ, Nahat, Zera, Shama na Miza. Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
14Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ. Oholibama bụ nwa Ana na nwa nwa Zibiọn. Ọ mụtaara Ịsọ Jeush, Jalam na Kora.
15Ndị a bụ ọnụmara si nʼetiti ụmụ ụmụ Ịsọ. Site nʼetiti ụmụ Elifaz, ọkpara Ịsọ, e nwere Ọnụmara Teman, ọnụmara Ọmaa, ọnụmara Zefo, ọnụmara Kenaz.
16Ọnụmara Kora, ọnụmara Gatam na ọnụmara Amalek. Ndị eze ndị a bụ ụmụ Elifaz nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Ada.