38Mgbe Shaul nwụrụ, Baal-Hanan nwa Akboa nọchiri ya dịka eze.
39Mgbe Baal-Hanan nwa Akboa nwụrụ, Heda nọchiri ya dịka eze. Aha obodo ya bụ Pau. Aha nwunye ya bụ Mehetabel, nwa Matred nwa nwa Mezahab.
40Ndị a bụ ndịisi ọnụmara Ịsọ, dịka aha ha si dị, dịka ikwu ha na akụkụ ebe ha bi si dị: Timna, Alva, Jetet,
41Oholibama, Elaa, Pinon,
42Kenaz, Teman, Mibza,