1Jekọb bigidere nʼala Kenan, ala ahụ nna ya buru ụzọ biri nʼime ya.
2Nke a bụ usoro akụkọ banyere ezinaụlọ Jekọb. Josef, onye gbarala afọ iri na asaa, na-esonyere ụmụnne ya ndị ikom na-azụ igwe anụ ụlọ, ya onwe ya bụ naanị nwantakịrị na-enyere ụmụ Bilha na ụmụ Zilpa ndị nwunye nna ya aka. Ma Josef na-ewetara nna ha akụkọ maka ihe ọjọọ ha na-eme.
3Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa.