15ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”
16Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?”
17Nwoke ahụ zara sị, “Ha esitela nʼebe a pụọ. Anụrụ m ka ha na-asị, ‘Ka anyị gaa Dọtan.’ ” Ya mere, Josef gawara Dọtan ịchọ ụmụnne ya. Ọ hụkwara ha nʼebe dị nso na Dọtan.
18Ma ha lepụrụ anya hụ ya ka ọ na-abịa, gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
19Ha sịrịtara onwe ha, “Lee eze nrọ ahụ ka ọ na-abịa!