20Ugbu a, bịanụ, ka anyị gbuo ya, tụba ya nʼime otu olulu ndị a. Anyị ga-asịkwa na anụ ọhịa eriela ya. Mgbe ahụ, anyị ga-ahụkwa ihe nrọ ya niile ga-abụ.”
21Ruben nụrụ ihe a, ma napụtakwa ya site nʼaka ha. Ọ sịrị, “Ka anyị hapụ igbu ya.”
22Ruben sịrị ha, “Ka unu hapụ ịkwafu ọbara. Kama tụnyenụ ya nʼime olulu a dị nʼọzara. Ma unu akpatụkwala ya aka.” Ma nzube ya bụ ịnapụta ya site nʼaka ha, dulaara ya nna ya.
23Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ.
24Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya.