3Ma Izrel hụrụ Josef nʼanya karịa ụmụ ya ndị ikom ndị ọzọ niile nʼihi na Josef bụ nwa a mụụrụ ya nʼoge agadi ya. Ọ kwaara ya uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa.
4Mgbe ụmụnne ya chọpụtara na nna ha hụrụ ya nʼanya karịa onye ọbụla nʼime ha, ha kpọrọ ya asị, ha adịghị agwakwa ya okwu ọma.
5Otu oge, Josef rọrọ nrọ, mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya nrọ a ọ rọrọ, ha kpọrọ ya asị karịa.
6Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ.
7Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.”