6Ọ gwara ha, “Geenụ ntị na nrọ a m rọrọ.
7Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.”
8Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile.
9Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.”
10Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?”