Jenesis 38

Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”

Genesis 38:23 (UKJV) And Judah said, Let her take it to her, lest we be shamed: behold, I sent this kid, and you have not found her.

21Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”

22Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ”

23Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.”

24Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”

25Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.