7Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.
8Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”
9Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa.
10Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya.
11Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya.