Jenesis 38

Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.

Genesis 38:7 (UKJV) And Er, Judah's firstborn, was wicked in the sight of the LORD; and the LORD slew him.

5Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ Shela. Ọ bụ na Kezib ka ọ mụrụ ya.

6Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ Tama.

7Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.

8Mgbe ahụ, Juda sịrị Onan, “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.”

9Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.