11Otu ụbọchị, Josef batara nʼime ụlọ ịrụ ọrụ ya. O nweghị ndị ọzọ na-eje ozi nọ nʼime ụlọ nʼụbọchị ahụ.
12Nwunye Pọtifa jidere Josef nʼuwe mwụda ya, rịọọ ya sị ya, “Bịa ka anyị dinaa.” Ma Josef si nʼime ụlọ ahụ gbapụ, hapụ uwe mwụda ya nʼaka nwunye Pọtifa.
13Mgbe nwanyị a hụrụ na Josef agbapụla, hapụ uwe ya,
14ọ kpọrọ ndị na-eje ozi nʼezinaụlọ ya sị ha, “Lee, onye Hibru a di m kpọbatara nʼụlọ a chọrọ iji anyị gwurie egwu. Ọ bịakwutere m nʼime ụlọ chọọ ka mụ na ya dinaa. E tiri m mkpu nʼolu ike.
15Mgbe ọ nụrụ ka m welitere olu m tie mkpu enyemaka m tiri, o sitere nʼime ụlọ a gbapụ, ma hapụrụ m uwe ya.”