16Nwanyị a debere uwe ahụ nʼakụkụ ya ruo mgbe nna ya ukwu lọtara nʼụlọ.
17Mgbe ahụ, ọ gwara di ya okwu ndị a sị, “Onye ohu Hibru a ị kpọbataara anyị bakwutere m iji m gwurie egwu.
18Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.”
19Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ.
20Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,