Jenesis 39

Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,

Genesis 39:20 (UKJV) And Joseph's master took him, and put him into the prison, a place where the king's prisoners were bound: and he was there in the prison.

18Ma mgbe m welitere olu tie mkpu enyemaka o sitere nʼụlọ gbapụ hapụrụ m uwe ya.”

19Mgbe nna ya ukwu nụrụ ihe nwunye ya gwara ya sị, “Otu a ka ohu gị si meso m mmeso,” o were iwe dị ọkụ.

20Nna ukwu Josef weere ya tụnye nʼụlọ mkpọrọ, nʼebe a na-etinye ndị mkpọrọ eze Ijipt. Ma ebe ahụ Josef nọ nʼụlọ mkpọrọ,

21Onyenwe anyị nọnyeere ya. O meere ya ebere, mekwa ka o nweta ihuọma nʼebe onyeisi ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ nọ.

22Onyeisi ndị na-eche ụlọ mkpọrọ mere Josef onyeisi ndị mkpọrọ niile nọ nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ. Josef ghọrọ onye a na-ajụ otu ihe si aga nʼime ụlọ mkpọrọ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.