9Emesịa, Onyenwe anyị jụrụ Ken ajụjụ sị, “Ebee ka Ebel nwanne gị nwoke nọ?” Ọ zaghachiri, “Amaghị m. Abụ m onye nche nwanne m?”
10Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Gịnị ka i mere? Gee ntị, ọbara nwanne gị na-akpọku m site nʼala.
11Site ugbu a gaa nʼihu ị bụrụla onye a bụrụ ọnụ, na onye e si nʼala chụpụ, ala ahụ meghepụrụ ọnụ ya nabata ọbara nwanne gị, site nʼaka gị.
12Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.”
13Ken zara Onyenwe anyị, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu.