Jenesis 4

Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.”

Genesis 4:14 (UKJV) Behold, you have driven me out this day from the face of the earth; and from your face shall I be hid; and I shall be a fugitive and a vagabond in the earth; and it shall come to pass, that every one that finds me shall slay me.

12Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa.”

13Ken zara Onyenwe anyị, “Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu.

14Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.”

15Onyenwe anyị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya.

16Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.