Jenesis 4

Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.”

Genesis 4:25 (UKJV) And Adam had sexual contact with his wife again; and she bare a son, and called his name Seth: For God, said she, has appointed me another seed instead of Abel, whom Cain slew.

23Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ.

24Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa, mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.”

25Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.”

26Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh. Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.