1Emesịa, Adam na nwunye ya Iiv dinakọrọ dịka di na nwunye. Iiv tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye ha gụrụ Ken. Iiv sịrị, “Site nʼinyeaka Onyenwe anyị, amụtala m nwa nwoke!”
2Emesịa Iiv mụtara nwanne ya nwoke Ebel. Ebel ghọrọ onye na-azụ igwe atụrụ. Ma Ken ghọrọ onye ọrụ ubi.
3Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara Onyenwe anyị ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye.
4Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. Onyenwe anyị nabatara Ebel na onyinye ya,
5ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ.