15Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị Hibru. Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.”
16Mgbe onyeisi ndị na-esiri Fero nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị Josef, “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi.
17Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ Fero. Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.”
18Josef zara sị ya, “Lee ihe nrọ gị pụtara. Nkata atọ ahụ bụ abalị atọ.
19Nʼime abalị atọ ka Fero ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.”