1Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt.
2Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
3O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
4Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị.