2Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
3O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
4Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị.
5Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya.
6Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ.